7“Ha zara sị ya, ‘Nʼihi na ọ dịghị onye kpọrọ anyị ọrụ.’ “Ọ gwara ha sị, ‘Unu onwe unu gaakwanụ rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m. Aga m akwụkwa unu ihe dị mma.’
8“Mgbe o ruru oge anyasị, onye nwe ubi vaịnị ahụ gwara onye na-elekọtara ya ndị ahụ anya sị, ‘Kpọkọta ndị ọrụ ahụ kwụọ ha ụgwọ, site na ndị ikpeazụ bịara ọrụ ruo na ndị bu ụzọ.’
9“Mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nʼelekere ise anyasị naara ego ha, a kwụrụ ha otu denarị, otu denarị.
10Ma mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nʼisi ụtụtụ bịara ịnara ego ha, ha lere anya na a ga-akwụ ha karịa. Ma a kwụkwara ha niile otu denarị.
11Mgbe ha naara ego ahụ, ha tamuru ntamu megide nna nwe ụlọ,