Matiu 21

Ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼekpere, ọ bụrụ na unu ekwere unu ga-anatakwa ya.”

Matthew 21:22 (UKJV) And all things, whatsoever all of you shall ask in prayer, believing, all of you shall receive.

20Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, o juru ha anya, ha jụọ sị, “Gịnị mere osisi fiig a ji kpọnwụọ ngwangwa otu a?”

21Jisọs zara sị ha, “Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na unu e nwee okwukwe, gharakwa inwe obi abụọ, ọ bụghị naanị na unu ga-eme ihe e mere osisi fiig ahụ. Unu pụrụ inye ugwu a iwu sị ya, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa danye nʼoke osimiri.’ Ọ ga-emezukwa.

22Ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼekpere, ọ bụrụ na unu ekwere unu ga-anatakwa ya.”

23Mgbe Jisọs batara nʼogige ụlọnsọ ukwu ahụ, ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu bịakwutere ya ka ọ nọ na-akụzi ihe jụọ ya sị, “Olee ikike i ji na-eme ihe ndị a niile? Ọ bụ onye nyekwara gị ikike a?”

24Jisọs zara sị ha, “Aga m ajụkwa unu otu ajụjụ. Ọ bụrụ na unu azaa ya, aga m agwakwa unu onye nyere m ikike m ji eme ihe ndị a niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.