27Ya mere ha zara Jisọs sị ya: “Anyị amaghị.” Jisọs zakwara ha sị, “Mụ onwe m agaghị agwakwa unu ikike m ji na-eme ihe ndị a.
28“Gịnị ka unu chere banyere ihe a? Otu nwoke nwere ụmụ nwoke abụọ gwara nwa ya nke okenye sị ya, ‘Nwa m nwoke, gaa rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m taa.’
29“Ọ zara ya sị, ‘Agaghị m aga.’ Ma o mesịrị gbanwee obi ya gaakwa rụọ ọrụ ahụ.
30“Nna ha bịakwutere nwa ya nke nta gwakwa ya otu ihe ahụ. Nwa ahụ zakwara sị, ‘Aga m aga, onyenwe anyị.’ Ma nʼikpeazụ ọ gaghị.
31“Onye nʼime ha abụọ mere ihe nna ya chọrọ?” Ha zara sị ya, “Onye nke mbụ.” Jisọs kọwaara ha sị, “Nʼezie agwa m unu, ndị ọna ụtụ na ụmụ nwanyị akwụna ga-ebu unu ụzọ banye nʼalaeze Chineke.