9Unu akpọkwala onye ọbụla nʼụwa a ‘Nna,’ nʼihi na unu nwere otu Nna nke bi nʼeluigwe.
10Unu ekwela ka a kpọọ unu ndị ndu, nʼihi na ọ bụ naanị otu onyendu ka unu nwere, ya bụ Kraịst.
11Onye dị ukwuu nʼetiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi.
12Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda nʼala. Ma onye ọbụla wedara onwe ya ala, ka a ga-ebuli elu.”
13“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-emechibido ndị ọzọ ụzọ ha ga-esi bata nʼalaeze eluigwe, ma unu onwe unu adịghị abata. Unu adịghịkwa enye ndị ọzọ ohere ịbata.