Matiu 23

“Ahụhụ ga-adakwasị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-agafe oke osimiri na mba dị iche iche, ime ka otu onye chegharịa, bụrụ onye na-eso ụzọ unu. Ma mgbe unu mesịrị nke a, unu na-alaghachi mee ya okpukpu abụọ ka ọ bụrụ nwa ọkụ ala mmụọ karịa onwe unu.

Matthew 23:15 (UKJV) Woe unto you, scribes and Pharisees, hypocrites! for all of you compass sea and land to make one proselyte, and when he is made, all of you make him twofold more the child of hell than yourselves.

13“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-emechibido ndị ọzọ ụzọ ha ga-esi bata nʼalaeze eluigwe, ma unu onwe unu adịghị abata. Unu adịghịkwa enye ndị ọzọ ohere ịbata.

14“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-eripịa ụlọ ndị inyom di ha nwụrụ, ọ bụladị mgbe unu na-ekpe ogologo ekpere ka mmadụ hụ unu. Unu ga-anata ikpe ọmụma dị ukwuu.

15“Ahụhụ ga-adakwasị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-agafe oke osimiri na mba dị iche iche, ime ka otu onye chegharịa, bụrụ onye na-eso ụzọ unu. Ma mgbe unu mesịrị nke a, unu na-alaghachi mee ya okpukpu abụọ ka ọ bụrụ nwa ọkụ ala mmụọ karịa onwe unu.

16“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị ndu kpuru ìsì! Nʼihi na unu na-asị, Onye ọbụla jiri ụlọnsọ ṅụọ iyi, iyi ọ ṅụrụ bụ ihe efu. Ma onye ọbụla jiri ọlaedo dị nʼime ụlọnsọ ṅụọ iyi kwesiri imezu iyi ahụ ọ ṅụrụ.

17Ndị nzuzu kpuru ìsì! Olee nke karịrị ukwuu? Ọ bụ ọlaedo ahụ, ka ọ bụ ụlọnsọ nke doro ọlaedo ahụ nsọ?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.