17Ndị nzuzu kpuru ìsì! Olee nke karịrị ukwuu? Ọ bụ ọlaedo ahụ, ka ọ bụ ụlọnsọ nke doro ọlaedo ahụ nsọ?
18Unu na-ezikwa ndị mmadụ sị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ ejiri ebe ịchụ aja ṅụọ iyi, iyi ahụ ọ ṅụrụ bụ ihe efu. Ma onye ọbụla ga-eji onyinye dị nʼelu ebe ịchụ aja ṅụọ iyi ga-emezu iyi ahụ ọ ṅụrụ.’
19Leenụ ka unu si bụrụ ndị ìsì! Olee nke karịrị ukwuu? Ọ bụ onyinye dị nʼelu ebe ịchụ aja ka ọ bụ ebe ịchụ aja na-edo onyinye ahụ nsọ?
20Ya mere, mgbe onye ọbụla ji ebe ịchụ aja ṅụọ iyi, ọ bụ ebe ịchụ aja ahụ na onyinye dị nʼelu ya ka o ji ṅụọ iyi ahụ.
21Otu a kwa, onye ji ụlọnsọ ahụ ṅụọ iyi jikwa ụlọnsọ ahụ na onye bi nʼime ya na-aṅụ iyi.