23“E, ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu. Ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-asa anya unu mmiri nye, ọ bụladị onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri unu ruo nʼakwụkwọ nri dịkarịsịrị nta dị nʼubi unu, dịka mint, diil na kumin, ma unu akpọghị ikpe ziri ezi na ebere, na okwukwe ihe dị mkpa. Ihe ndị a ka unu kwesiri ibu ụzọ mee ma gharakwa ileghara iwu ndị ọzọ anya.
24Ndị ndu kpuru ìsì! Unu na-azapụ ijiji site na mmanya unu na-aṅụ, ma unu na-eloda ịnyịnya kamel.
25“Ahụhụ ga-adakwasị unu, ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-elezi anya nke ọma mee ka azụ iko mmiri unu, na azụ efere unu dị ọcha, ma ime ha jupụtara na ịpụnarị mmadụ ihe nʼike na ọchịchọ ọjọọ niile.
26Gị onye Farisii kpuru ìsì! Buru ụzọ mee ka ime iko dị ọcha, mgbe ahụ azụ ya ga-adịkwa ọcha.
27“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu yiri ili e tere nzu, nke na-egosi onwe ya dị ka ihe mara mma, ma ime ya jupụtara nʼọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ, na ihe niile na-adịghị ọcha.