32Gaanụ sorokwa nzọ ụkwụ nna unu ha, ka unu rụzuo ọrụ ahụ ha malitere.
33“Ụmụ agwọ! Ụmụ ajụala! Unu si aṅaa chee na unu ga-agbanarị ikpe nke ịba nʼọkụ ala mmụọ?
34Ya mere, aga m ezitere unu ndị amụma, ndị amamihe na ndị nkuzi. Ụfọdụ nʼime ha ka unu ga-egbu, ụfọdụ ka unu ga-akpọgide nʼobe, ndị ọzọkwa ka unu ga-apịa ihe nʼụlọ nzukọ unu. Unu ga-achụkwa ha ọsọ site nʼotu obodo gaa nʼobodo ọzọ.
35Ka ọgbọ a bụrụ ndị ikpe mara nʼihi ọbara nke ndị ezi omume niile e gburu nʼụwa, site nʼọbara Ebel ruo na nke Zekaraya nwa Berekaya, onye unu gburu nʼetiti ụlọnsọ nʼebe ịchụ aja unu.
36Nʼezie agwa m unu, ihe ndị a niile, ga-abịakwasị ọgbọ a.