31Ọ ga-ewerekwa olu opi ike zipụ ndị mmụọ ozi ka ha gaa kpọkọtaa ndị niile a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke eluigwe na ụwa.
32“Ugbu a mụtanụ ihe site nʼosisi fiig. Mgbe ọbụla alaka ya malitere iwepụta ome dị nro, na-epupụtakwa akwụkwọ ndụ maranụ na ọkọchị na-abịa nso.
33Otu a kwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a niile ka ha na-eme marakwanụ na ọ nọ nso, ọ bụladị nʼọnụ ụzọ unu.
34Nʼezie agwa m unu, ihe ndị a niile aghaghị imezu tupu ọgbọ a agabiga.
35Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.