36“Ma o nweghị onye ọbụla maara ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ ga-abụ. Ọ bụladị ndị mmụọ ozi nọ nʼeluigwe amaghị ya. Ọkpara ahụ amakwaghị. Ọ bụ naanị Nna maara ya.
37Ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka ọ dị nʼụbọchị Noa.
38Nʼoge ahụ tupu iju mmiri ahụ abịa, ndị mmadụ nọ na-eri na aṅụ, na-emekwa mmemme ọlụlụ di na nwunye, ruo ụbọchị Noa banyere nʼime ụgbọ mmiri ya.
39Ha amataghị ihe ga-eme tutu oke mmiri ahụ abịa kpochapụ ha niile. Otu ahụ ka ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị.
40Mmadụ abụọ ga na-arụkọ ọrụ nʼubi ha, a ga-ewepụ otu hapụkwa onye nke ọzọ.