39Ha amataghị ihe ga-eme tutu oke mmiri ahụ abịa kpochapụ ha niile. Otu ahụ ka ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị.
40Mmadụ abụọ ga na-arụkọ ọrụ nʼubi ha, a ga-ewepụ otu hapụkwa onye nke ọzọ.
41Ụmụ nwanyị abụọ ga na-akwọ nri na nkume igwe nri, a ga-ewere otu, ma hapụkwa nke ọzọ.
42“Nʼihi nke a, na-echenụ nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.
43Ma ghọtanụ nke a: Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ mara oge onye ohi ga-abịa nʼụlọ ya nʼabalị, ọ ga-anọ na nche nʼoge ahụ. Ọ gaghị ekwe ka onye ohi kụwaa ụlọ ya.