42“Nʼihi nke a, na-echenụ nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.
43Ma ghọtanụ nke a: Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ mara oge onye ohi ga-abịa nʼụlọ ya nʼabalị, ọ ga-anọ na nche nʼoge ahụ. Ọ gaghị ekwe ka onye ohi kụwaa ụlọ ya.
44Otu a ka unu onwe unu pụrụ isi nọgide na nche oge niile, nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼoge awa unu na-atụghị anya ya.
45“Onye bụ ohu ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi ma nwekwa uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ndị ohu nọ nʼezinaụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri nʼoge ya?
46Ngọzị na-adịrị ohu ahụ, onye, mgbe onyenwe ya ga-alọghachi hụ na ọ na-eme otu a.