46Ngọzị na-adịrị ohu ahụ, onye, mgbe onyenwe ya ga-alọghachi hụ na ọ na-eme otu a.
47Nʼezie asị m unu, ọ ga-eme ya onyeisi nke ihe niile o nwere.
48Ma ọ bụrụ na ohu ahụ bụ onye ajọọ omume na-asị onwe ya, ‘Nna m ukwu anọọla ogologo oge,’
49ọ bụrụkwa na o bido iti ndị ohu ibe ya ihe, sorokwa ndị ọṅụ oke mmanya na-eri, na-aṅụ.
50Nna ukwu ohu ahụ ga-alọta nʼụbọchị ọ na-atụghị anya, nʼoge awa ọ na-amakwaghị.