25Nʼihi nke a, atụrụ m egwu, a gara m liere gị ego talenti gị nʼala. Lee ihe gị werekwa.’
26“Nna ya ukwu zara ya sị, ‘Ohu ọjọọ na onye umengwụ. Ị maara na m na-ewe ihe ubi nʼebe m na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa nʼebe m na-agbasaghị.
27Ị gaara etinye ego m nʼaka ndị na-echekwa ego, ndị gaara akwụghachi ya na ọmụrụnwa ya, nke m gaara anata mgbe m lọghachiri.
28“ ‘Napụtanụ ya talenti ahụ o ji, were ya nye onye ji talenti iri.
29Nʼihi na onye ọbụla nwere ka a ga e tinyekwuru ka o nwebigakwa oke. Ma onye ahụ ọ na-adịghị nke o nwere, a ga-anapụ ya ọ bụladị nke nta o nwere.