1“A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere akụkọ ụmụ agbọghọ iri ndị weere oriọna ha pụta izute onye na-alụ nwunye ọhụrụ.
2Ise nʼime ha maara ihe, ma ise ndị ọzọ bụ ndị nzuzu.
3Ise ndị nzuzu ahụ weere oriọna ha, ma ha ejighị mmanụ ọkụ.
4Ise ndị maara ihe, wụjuru mmanụ ọkụ na karama, tinyekwa oriọna ha.
5Mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ ahụ nọrọ ọdụ nʼọbịbịa ya, ụra tụwara ha, ha dinara ala rahụ ụra.