29Nʼihi na onye ọbụla nwere ka a ga e tinyekwuru ka o nwebigakwa oke. Ma onye ahụ ọ na-adịghị nke o nwere, a ga-anapụ ya ọ bụladị nke nta o nwere.
30Tụpụnụ ohu a na-abaghị uru nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’
31“Mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube ya na ndị mmụọ ozi niile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọ nʼelu ocheeze ebube ya.
32Mba niile nke ụwa ga-ezukọtakwa nʼihu ya. Ọ ga-ekewapụta ha, otu obodo site nʼibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ sị ekewapụta ụmụ atụrụ site nʼụmụ ewu.
33Ọ ga-edebe ụmụ atụrụ ahụ nʼakụkụ aka nri ya, ma ụmụ ewu ga-anọ nʼaka ekpe ya.