42Nʼihi na mgbe agụụ na-agụ m, unu enyeghị m ihe ọbụla ka m rie. Mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ, unu ekunyeghị m mmiri ka m ṅụọ.
43Mgbe m nọ dị ka ọbịa, unu akpọbataghị m nʼụlọ unu. Mgbe m gba ọtọ, unu enyeghị m uwe. Mgbe ahụ na-esighị m ike, unu elekọtaghị m. Mgbe m nọ nʼụlọ mkpọrọ, unu abịaghị leta m.’
44“Mgbe ahụ ha ga-azakwa sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, maọbụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, maọbụ oge ị bụ onye ọbịa, maọbụ oge ị gba ọtọ, maọbụ oge ị nọ nʼọrịa, maọbụ ị nọ nʼụlọ mkpọrọ, ma anyị elekọtaghị gị?’
45“Ọ ga-aza ha sị, ‘Eziokwu ahụ bụ nke a, mgbe ahụ unu jụrụ inyere otu nʼime ndị a dị nta aka, ọ bụ m ka unu jụrụ i nyere aka.’
46“Ndị a ga-aba nʼịta ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.”