7“Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ niile ahụ biliri mụnye oriọna ha.
8Ise ndị nzuzu ahụ rịọrọ ise ndị maara ihe sị, ‘Biko, wụnyetụrụnụ anyị ụfọdụ nʼime mmanụ ọkụ unu, lee na oriọna anyị na-anyụ anyụ.’
9“Ndị maara ihe zara ha sị, ‘Mba! Ọ gaghị ezuru anyị na unu. Kama gaanụ zuru nke unu nʼaka ndị na-ere ya.’
10“Ma mgbe ha pụrụ ịzụta mmanụ ọkụ ahụ, onye na-alụ nwunye ọhụrụ bịarutere. Ndị jikeere ejikere soro ya banye nʼoriri ọlụlụ di na nwunye ahụ. E mechikwara ọnụ ụzọ.
11“Emesịa, ise ndị nzuzu ahụ lọghachiri na-ekwu sị, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, meghere anyị ụzọ!’