27Mgbe ahụ kwa, o burukwara iko mmanya, ma mgbe o nyechara ekele, o bunyere ya ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Unu niile ṅụọnụ site nʼiko a.
28Nʼihi na nke a bụ ọbara m nke bụ akara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. A na-awụsa ya maka ọtụtụ mgbaghara mmehie.
29Ana m agwa unu, na-agaghị m aṅụ mmanya sitere na mkpụrụ vaịnị ọzọ, tutu ruo ụbọchị ahụ mụ na unu ga-aṅụ ya nʼụzọ dị iche nʼalaeze Nna m.”
30Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv.
31Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Nʼabalị taa, unu niile ga-agbahapụ naanị m. Nʼihi na e dere ya, sị: “ ‘Aga m etigbu onye ọzụzụ atụrụ, atụrụ nke igwe atụrụ ahụ ga-agbasasịkwa.’