1Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị,
2“Dị ka unu maara nke ọma, Mmemme Ngabiga ga-amalite mgbe ụbọchị abụọ gasịrị. Nʼoge ahụ, a ga-ararakwa Nwa nke Mmadụ nye ka a kpọgide ya nʼobe.”
3Nʼoge ahụ, ndịisi nchụaja, na ndị okenye zukọtara nʼụlọeze otu onyeisi nchụaja a na-akpọ Kaịfas.
4Ha gbara izu ịchọpụta ụzọ ha ga-esi jide Jisọs na nzuzo gbuo ya.
5Ha kwekọrịta sị, “Ọ gaghị abụ nʼoge mmemme ka ọgbaaghara hapụ ịdị nʼetiti ndị mmadụ.”