11Nʼoge a Jisọs guzo nʼihu gọvanọ. Gọvanọ jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Jisọs sịrị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.”
12Mgbe ndịisi nchụaja na ndị okenye boro ya ebubo ụgha, o kwughị ihe ọbụla.
13Ya mere, Pailet sịrị ya, “Ị naghị anụ ihe ndị a niile ha na-ebo gị?”
14Ma ọ zaghị ọ bụladị otu mkpụrụ okwu nʼebubo ndị ahụ. Ihe a gbagwojuru gọvanọ anya nke ukwuu.
15Ugbu a, ọ bụ omenaala gọvanọ nʼoge mmemme na ọ ga-ahapụ otu onye mkpọrọ, bụ onye igwe mmadụ họọrọ.