4Ọ kwuru sị, “Emehiela m, site na ịrara onye aka ya dị ọcha nye ọnwụ.” Ma ha sịrị, “Nke ahụ agbasaghị anyị, ọ bụ mkpa dịrị gị.”
5Ọ wụsara ego ọlaọcha ahụ nʼala ụlọnsọ, pụọ gaa kwụọ ụdọ.
6Ndịisi nchụaja tụtụkọtara ego ahụ kwuo sị, “O megidere iwu itinye ego a nʼime ụlọakụ, nʼihi na ọ bụ ego ọbara.”
7Mgbe ha gbasịrị izu, ha kwekọtara ma were ego ahụ zụta ala nʼaka otu ọkpụ ite. Ha mere ala ahụ ka ọ bụrụ ebe a na-eli ndị ọbịa.
8Nke a mere e ji na-akpọ ala ahụ, “Ala Ọbara,” ruo taa.