8Ọzọkwa, ekwensu kpọọrọ ya gaa nʼelu ugwu dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa na ebube ha.
9Ọ sịrị ya, “Aga m enye gị ha niile ma ọ bụrụ na ị daa nʼala kpọọ isiala nye m.”
10Ma Jisọs sịrị ya, “Si nʼebe m nọ pụọ, ekwensu. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ọ bụ naanị Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, naanị ya ka ị ga-efekwa.’”
11Mgbe ahụ ekwensu hapụrụ ya laa. Ndị mmụọ ozi bịakwutere ya, nọnyere ya, na-ejere ya ozi.
12Mgbe Jisọs nụrụ na e tinyela Jọn nʼụlọ mkpọrọ, ọ pụrụ gaa Galili.