5Mgbe ahụ, ekwensu duuru ya baa nʼobodo nsọ ahụ, mee ka o guzo nʼebe dịkarịsịrị elu nke ụlọnsọ ukwu,
6sị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, site nʼebe a tụda onwe gị nʼala. Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “ ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ha ga-ebuli gị elu nʼaka ha ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.’”
7Ma Jisọs zara sị ya, “E deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ị gaghị anwa Onyenwe gị na Chineke gị ọnwụnwa.’”
8Ọzọkwa, ekwensu kpọọrọ ya gaa nʼelu ugwu dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa na ebube ha.
9Ọ sịrị ya, “Aga m enye gị ha niile ma ọ bụrụ na ị daa nʼala kpọọ isiala nye m.”