12Ṅụrịanụ ọnụ, nwekwanụ obi ụtọ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na nʼụzọ dị otu a ka ha sogburu ndị amụma ndị buru unu ụzọ.
13“Unu bụ nnu nke ụwa, ma ọ bụrụ na nnu adịghị atọkwa ụtọ, a ga-eji gịnị mee ka ọ tọọ ụtọ ọzọ? Ọ bakwaghị uru ọbụla, ma ọ bụghị naanị itufu ya, ka ndị mmadụ zọọ ya ụkwụ.
14“Unu bụ ihe nke ụwa. Unu dị ka obodo e wuru nʼelu ugwu nke a na-apụghị izo ezo.
15Ndị mmadụ adịghị amụnye oriọna dọnye ya nʼokpuru igbe, kama a na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba oriọna, ka o nye ndị niile nọ nʼụlọ ahụ ìhè.
16Ya mere, kwerenụ ka ìhè unu nwuo nye mmadụ niile, ka ndị mmadụ hụ ọrụ ọma unu, tookwa Nna unu nke bi nʼeluigwe.