18Nʼezie, agwa m unu, na tutu eluigwe na ụwa agabiga, ọ dịghị otu mkpụrụ edemede ọbụla dị nta, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, nke a ga-esi nʼIwu a wepụ ruo mgbe ha niile ga emezu.
19Nʼihi ya, onye ọbụla nke ga-emebi otu nʼime iwu ndị a, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, ma kuziekwara ndị ọzọ ime otu ahụ, a ga-agụ onye ahụ nʼonye dịkarịsịrị nta nʼalaeze eluigwe. Ma onye na-ezi ụmụ mmadụ ka ha debe iwu ahụ, ma na-emekwa okwu ndị ahụ nʼonwe ya, a ga-akpọ ya onye dị ukwuu nʼalaeze eluigwe.
20Ka m dọọ unu aka na ntị. Ọ bụrụ na ezi omume unu akarịghị ezi omume ndị Farisii na ndị ozizi iwu, unu apụghị ịba nʼalaeze eluigwe ma ọlị.
21“Unu nụrụ na-agwara ndị mmadụ nʼoge gara aga, sị, ‘Onye egbula mmadụ, onye ọbụla gburu mmadụ a ga-ekpe ya ikpe.’
22Ma asị m unu, na onye ọbụla nke na-ewe iwe megide nwanna ya, na-enyefe onwe ya nʼaka ikpe. Onye ọbụla nke na-akpọ nwanna ya ‘Raka,’ ya bụ Onye iberiibe, ga-aza ajụjụ nʼụlọikpe. Ọzọkwa, onye ọbụla nke kpọrọ nwanne ya, ‘Onye nzuzu,’ na-edo onwe ya ịba nʼọkụ ala mmụọ.