Matiu 6

Ka onyinye gị bụrụ na nzuzo. Mgbe ahụ, Nna gị, onye na-ahụ ihe dị na nzuzo ga-akwụghachi gị.

Matthew 6:4 (UKJV) That yours alms may be in secret: and your Father which sees in secret himself shall reward you openly.

2“Unu afụla opi mgbe unu na-enye ndị nọ na mkpa onyinye, nʼihi na otu a ka ndị ihu abụọ na-eme nʼụlọ nzukọ na nʼokporoụzọ, ka ndị mmadụ too ha. Nʼezie, ana m agwa unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼizuoke.

3Mgbe unu chọrọ ịrụ ọrụ ebere, meenụ ya na nzuzo. Ekwela ka aka ekpe gị mata ihe aka nri gị na-achọ ime.

4Ka onyinye gị bụrụ na nzuzo. Mgbe ahụ, Nna gị, onye na-ahụ ihe dị na nzuzo ga-akwụghachi gị.

5“Mgbe ọbụla unu chọrọ ikpe ekpere, unu emela dị ka ndị ihu abụọ, nʼihi na ha hụrụ iguzo nʼime ụlọ ekpere, nakwa nʼakụkụ ụzọ nʼanya na-ekpe ekpere, ebe ndị mmadụ ga-ahụ ha. Nʼezie, agwa m unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼebe o zuruoke.

6Kama, mgbe unu chọrọ ikpe ekpere, baanụ nʼime ime ụlọ unu. Mechiekwanụ ụzọ unu, kpọkuonụ Nna unu nʼekpere na nzuzo. Mgbe ahụ Nna unu, onye na-ahụ ihe e mere na nzuzo, ga-enye unu ụgwọ ọrụ unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.