21“Ọ bụghị ndị niile na-asị m ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-abanye nʼalaeze eluigwe, kama ọ bụ naanị ndị ahụ na-eme ihe Nna m nọ nʼeluigwe na-achọ ka ha mee.
22Nʼụbọchị ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ ga-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ọ bụ na anyị ejighị aha gị buo amụma, jiri aha gị chụpụ mmụọ ọjọọ, ma jirikwa aha gị ruo ọtụtụ ọrụ ebube?’
23Mgbe ahụ aga m agwa ha hoohaa sị ha, ‘Amaghị m unu, sitenụ nʼihu m pụọ, unu ndị ajọ omume!’
24“Onye ọbụla ṅara ntị nʼokwu ndị a m kwuru, ma meekwa ha, dị ka nwoke ahụ maara ihe, onye wuru ụlọ ya nʼelu oke nkume.
25Mmiri zosikwara ike nʼelu ụlọ ahụ, idee mmiri sọkwara, tie nʼụlọ ahụ. Ifufe siri ike fekwara, ma ụlọ ahụ adaghị. Nʼihi na e wuru ntọala ya nʼelu oke nkume.