25Mmiri zosikwara ike nʼelu ụlọ ahụ, idee mmiri sọkwara, tie nʼụlọ ahụ. Ifufe siri ike fekwara, ma ụlọ ahụ adaghị. Nʼihi na e wuru ntọala ya nʼelu oke nkume.
26Ma ndị niile nụrụ okwu ndị a, ma lefuru ha anya, bụ ndị nzuzu. Ha dị ka nwoke wuru ụlọ ya nʼelu aja.
27Ngwangwa mmiri zoro, idee mmiri sọkwara, ifufe fesikwara ike tie nʼụlọ ahụ, ụlọ ahụ dara daruo ala. Ọdịda ya dị ukwuu.”
28Mgbe Jisọs kwuchara okwu ndị a, ozizi ya juru igwe mmadụ ahụ niile anya.
29Nʼihi na o ziri ihe dịka onye nwere ikike. Ọ bụghị dị ka ndị ozizi iwu ha.