16“Ọ dịghị onye na-eji akwa ọhụrụ kwachie ebe akwa ochie siri dọkaa, nʼihi na akwa ahụ ga-esi nʼebe a kwachiri ya dọwaa; mee ka ọ dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ.
17Ọ dịkwaghị onye ga-etinye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ochie, nʼihi na karama ochie ahụ ga-agbawa mee ka mmanya ọhụrụ ahụ wufuo. Kama ọ dị mma itinye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ, nke ga-echekwa ha abụọ nke ọma.”
18Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu, otu onyeisi ụlọ ekpere bịara kpọọ isiala nye ya, sị, “Ọ dịbeghị anya nwa m nwanyị nwụrụ. Otu ọ dị, bịa ka ị bikwasị ya aka gị. Ọ ga-ebili dịkwa ndụ ọzọ.”
19Nʼihi nke a, Jisọs soro ya gawa. Ndị na-eso ụzọ ya sokwara ha.
20Ma o nwere otu nwanyị onye ahụ na-esighị ike. Nwanyị a anọọla nʼọrịa a afọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ọrịa oruru ọbara nke na-adịghị akwụsị akwụsị ka ọ na-arịa. Nwanyị a sitere nʼazụ bịaruo ya nso, metụ ọnụ uwe ya aka.