Maika 4

Nʼụbọchị ikpeazụ, ugwu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ga-abụ nke eguzobere dịka ugwu dị elu karịa ugwu niile, a ga-ebuli ya elu karịa ugwu nta niile, ndị dị iche iche ga-eruba nʼime ya dịka iyi.

Micah 4:1 (UKJV) But in the last days it shall come to pass, that the mountain of the house of the LORD shall be established in the top of the mountains, and it shall be exalted above the hills; and people shall flow unto it.

1Nʼụbọchị ikpeazụ, ugwu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ga-abụ nke eguzobere dịka ugwu dị elu karịa ugwu niile, a ga-ebuli ya elu karịa ugwu nta niile, ndị dị iche iche ga-eruba nʼime ya dịka iyi.

2Ọtụtụ mba ga-abịa ma sịkwa, “Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu Onyenwe anyị, ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb. Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya niile, ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.” Iwu ga-esi na Zayọn pụta, okwu Onyenwe anyị ga-esitekwa na Jerusalem pụta.

3Ọ ga-ekpe ikpe dị nʼetiti ndị dị iche iche, doziekwa esemokwu dị nʼetiti mba na mba ibe ya ruo ebe dị anya. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile, mee ka ha bụrụ mma oge, kpụgharịkwa ùbe ha ka ha ghọọ mma ịkwacha osisi. Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ, maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.