12Aga m ala mgbaasị unu nʼiyi, unu agaghị enwekwa ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase.
13Aga m ala arụsị a pịrị apị unu niile nʼiyi, ya na nkume nsọ ahụ niile dị nʼetiti unu. Unu agakwaghị akpọ isiala nye ihe unu ji aka unu kpụọ.
14Aga m ehopu ogidi arụsị niile nke dị nʼetiti unu, mgbe m ga-akụdasị obodo unu niile
15Aga m esite nʼoke iwe m na ọnụma m bọọrọ onwe m ọbọ nʼahụ mba niile ndị ahụ jụrụ irubere m isi.”