Maika 7

Ma ụwa ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼihi ndị bi nʼime ya, iji kwụọ ha ụgwọ ihe ọjọọ niile ha mere.

Micah 7:13 (UKJV) Notwithstanding the land shall be desolate because of them that dwell therein, for the fruit of their doings.

11Ụbọchị a ga-ewugharị mgbidi gị niile na-abịa; ụbọchị a ga-eme ka oke ala gị saa mbara.

12Nʼụbọchị ahụ, ha ga-abịakwute gị, site na Asịrịa ruo na obodo niile nke Ijipt, sitekwa nʼIjipt ruo Yufretis, site nʼosimiri ruo osimiri, sitekwa nʼugwu ruo nʼugwu.

13Ma ụwa ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼihi ndị bi nʼime ya, iji kwụọ ha ụgwọ ihe ọjọọ niile ha mere.

14Were mkpanaka gị zụọ ndị gị, bụ igwe ewu na atụrụ nke ihe nketa gị, ndị bi naanị ha nʼoke ọhịa, nʼebe ịta nri nke ahịhịa ndụ jupụtara. Kwere ka ha taa ahịhịa ndụ nke Bashan, na nke Gilead, dịka na mgbe ochie.

15“Dịka nʼụbọchị ahụ unu sitere nʼIjipt pụta, aga m egosi ha ọrụ ịtụnanya m niile.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.