15“Dịka nʼụbọchị ahụ unu sitere nʼIjipt pụta, aga m egosi ha ọrụ ịtụnanya m niile.”
16Mba dị iche iche ga-ahụ ya, ihere ga-emekwa ha, nʼime ịdị ike ha niile. Ha ga-ekpuchi aka nʼọnụ ha, ntị ga-echikwa ha.
17Ha ga-aracha aja dịka agwọ, na dịka anụ dị iche iche, nke na-akpụ akpụ nʼala. Ha ga-eji ịma jijiji si nʼebe ha e wusiri ike pụta. Nʼihi egwu ha, ha ga-abịakwute Onyenwe anyị bụ Chineke anyị. Ha ga-atụkwa egwu gị.
18Onye bụ chi ahụ dịka gị, nke na-agbaghara ma na-ehichapụ mmehie na njehie nke ndị fọdụrụ afọdụ nʼetiti ihe nketa gị? Ị naghị anọgide na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi, kama ị bụ onye ọ na-atọ ụtọ inwe obi ebere.
19Ọ ga-emekwara anyị ebere ọzọ. Ọ ga-azọdakwa mmehie anyị nʼokpuru ukwu ya, Ị ga-atụbakwa mmehie anyị niile nʼebe dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri.