Maika 7

Ekwenyerela onye agbataobi gị, atụkwasịla onye bụ ezi enyi gị obi. Kpachara anya gị, nʼihe gbasara okwu ọnụ gị, ọbụla dị nʼebe nwunye gị nọ.

Micah 7:5 (UKJV) Trust all of you not in a friend, put all of you not confidence in a guide: keep the doors of your mouth from her that lies in your bosom.

3Ọrụ nke aka ha abụọ na-arụpụta nke ọma bụ ajọ omume. Onyeisi na-ana onyinye, onye ọkaikpe na-eri ngarị, ndị dị ike na-atụpụta ihe masịrị ha, si otu a na-akpagbu eziokwu.

4Onye nke kachasị ibe ya ịdị mma nʼime ha dịka uke. Onye nke na-eme ihe ziri ezi nʼime ha jọrọ njọ karịa ogige ogwu. Ma ugbu a, ụbọchị Chineke na-eleta gị abịala, ụbọchị ahụ ndị nche gị na-akụ ekwe ịdọ aka na ntị. Ugbu a bụ oge ihe ịgba gharịị nye ha.

5Ekwenyerela onye agbataobi gị, atụkwasịla onye bụ ezi enyi gị obi. Kpachara anya gị, nʼihe gbasara okwu ọnụ gị, ọbụla dị nʼebe nwunye gị nọ.

6Nʼihi na nwa na-elelị nna ya anya. Nwa nwanyị na-ebili megide nne ya. Nwunye nwa megidekwa nne di ya, ndị iro mmadụ bụ ndị ezinaụlọ ya.

7Ma mụ onwe m, ana m ele Onyenwe anyị anya nʼihi inyeaka ya. Eji m olileanya na-echere Chineke Onye nzọpụta m. Chineke m ga-anụ olu m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.