Nehum 3

Ahụhụ dịrị obodo ọbara, nke jupụtara nʼụgha, na ihe e zutere nʼohi. Ọ dịghị mgbe ị na-adịghị adọgbu.

Nahum 3:1 (UKJV) Woe to the bloody city! it is all full of lies and robbery; the prey departs not;

1Ahụhụ dịrị obodo ọbara, nke jupụtara nʼụgha, na ihe e zutere nʼohi. Ọ dịghị mgbe ị na-adịghị adọgbu.

2Ụda ụtarị, ụda ụkwụ ụgbọ ịnyịnya, ikiri ụkwụ ịnyịnya na-agba ọsọ, na mkpọtụ nke ụgbọ ịnyịnya agha!

3Ndị agha ịnyịnya, na-agbagharị na-efegharị mma agha na-egbu amụma, na ùbe ha na-egbuke egbuke. Ndị e gburu egbu dị ọtụtụ, ntụkọta ozu tọgbọrọ ebe niile, ozu a na-enweghị ike ịgụta ọnụ, ndị mmadụ na-asọ ngọngọ mgbe ha na-azọkwasị ozu ụkwụ na-agafe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.