15Nʼebe ahụ ka ọkụ ga-erechapụ gị, mma agha ga-egbutu gị. Ọ ga-eripịa gị dịka igurube si erichapụ ihe niile dị ya nʼihu. Ọ bụladị ma i mee onwe gị ka i hie nne dịka ụkpana, maọbụ mụbaa dịka igurube.
16Ị meela ka ndị ahịa gị mụbaa nʼọnụọgụgụ, baa ụba karịa kpakpando dị nʼeluigwe, dịka igurube ha na-eripịa ala ahụ, gbasaa nku ha efelaga
17Ndị nche gị bara ụba igurube, ndị ode akwụkwọ gị dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka igwe igurube na-ebekwasị nʼelu mgbidi nʼụbọchị oyi. Ma mgbe anyanwụ wara, ha na-efelaga; ọ dịkwaghị onye maara ebe ha feere gaa.
18Eze ndị Asịrịa, ndị ọzụzụ atụrụ gị na-ero ụra, ndị unu a na-asọpụrụ adaala nʼụra ọnwụ. Ndị gị niile agbasasịala nʼelu ugwu niile, ọ dịkwaghị onye ha nwere nke ga-achịkọta ha.
19Ọ dịghị ihe nwere ike ime ka i si nʼọnọdụ ị nọ ugbu a biliekwa. Nʼihi na ọnya dị gị nʼahụ ga-egbu gị. Ndị niile nụrụ ihe dakwasịrị gị ga-eji ọṅụ kụọ aka ha, nʼihi na onye ka mmadụ ahụ bụ nke na-anụrụghị ụfụ nke enweghị obi ebere gị?