Nehemaya 1

Biko, Onyenwe anyị, nụrụ ekpere mụ bụ ohu gị, nụrụkwa ekpere ndị ohu gị niile ọ na-atọ ụtọ ịtụ egwu aha gị. Mee ka ihe gara ohu gị nke ọma taa site nʼimere ya ebere nʼihu nwoke a.” Nʼoge ahụ abụ m onye na-ebu ihe ọṅụṅụ eze.

Nehemiah 1:11 (UKJV) O LORD, I plead to you, let now yours ear be attentive to the prayer of your servant, and to the prayer of your servants, who desire to fear your name: and prosper, I pray you, your servant this day, and grant him mercy in the sight of this man. For I was the king's cupbearer.

9Ma ọ bụrụ na unu alaghachikwute m, debe ihe niile m nyere unu nʼiwu, a sikwa na a chụsara unu mee ka unu gbasaa ga nʼakụkụ niile nke ụwa, aga m achịkọta unu mee ka unu laghachi na Jerusalem bụ obodo m họpụtara nye Aha m.’

10“Anyị bụ ndị ohu gị, bụrụkwa ndị i ji aka gị dị ike zọpụta.

11Biko, Onyenwe anyị, nụrụ ekpere mụ bụ ohu gị, nụrụkwa ekpere ndị ohu gị niile ọ na-atọ ụtọ ịtụ egwu aha gị. Mee ka ihe gara ohu gị nke ọma taa site nʼimere ya ebere nʼihu nwoke a.” Nʼoge ahụ abụ m onye na-ebu ihe ọṅụṅụ eze.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.