2Ndị mmadụ toro ndị niile jiri afọ ofufu họrọ ịbịa soro biri na Jerusalem.
3Ndị a bụ ndịisi ala ahụ a na-achị achị ndị bịara biri na Jerusalem (ma ọtụtụ ndị Izrel, ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ na ụmụ ndị na-ejere Solomọn ozi biiri nʼobodo Juda, onye ọbụla nʼihe onwunwe ya nʼobodo ha dị iche iche.
4Ebe ndị ọzọkwa bụ ndị sitere na Juda na Benjamin, biiri na Jerusalem). Ndị sitere nʼagbụrụ Juda bụ ndị a: Ataia nwa Uzaya, nwa Zekaraya, nwa Amaraya, nwa Shefataya, nwa Mahalalel, nwa Perez;
5na Maaseia nwa Baruk, nwa Kol-Hoze, nwa Hazaia, nwa Adaya, nwa Joiarib, nwa Zekaraya, nwa onye Shilo.
6Ọnụọgụgụ ụmụ Perez niile bi na Jerusalem dị narị anọ, na iri isii na asatọ (468). Ha bụ ndị ikom gbara dimkpa.