33ha na Azaraya, Ezra, Meshulam,
34Juda, Benjamin, Shemaya, Jeremaya
35na ndị nchụaja ndị a ndị na-afụ opi, tinyere Zekaraya nwa Jonatan, nwa Shemaya. Ndị bụ nna nna Zekaraya bụ Matanaya, Mikaya na Zakua, ndị ikwu Asaf.
36Ndị otu ya, bụ Shemaya, Azarel, Milalai, Gilalai, Maai, Netanel, Juda na Hanani. Ha niile ji ngwa egwu ha, ụdị ngwa egwu ndị ahụ Devid onye nke Chineke nyere nʼiwu na ndị ọbụ abụ ga-eji. Ezra, bụ ode akwụkwọ nọ nʼihu na-edu ha.
37Mgbe ha rutere nʼỌnụ Ụzọ ama Isi Iyi, ha rigooro nʼelu nkwasa nrigo ụlọ elu e si abata nʼobodo Devid, si ebe ahụ gafee ụlọeze Devid, gaakwa lọghachi nʼỌnụ Ụzọ Ama Mmiri, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ.