37Mgbe ha rutere nʼỌnụ Ụzọ ama Isi Iyi, ha rigooro nʼelu nkwasa nrigo ụlọ elu e si abata nʼobodo Devid, si ebe ahụ gafee ụlọeze Devid, gaakwa lọghachi nʼỌnụ Ụzọ Ama Mmiri, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ.
38Ndị ọbụ abụ nke ọzọ bụ ndị na-enye ekele gara ụzọ aka ekpe. Mụ onwe m sooro ha nʼelu mgbidi ahụ, tinyere ọkara ndị mmadụ ahụ, gafee Ụlọ elu Ite Ọkụ jeruo Mgbidi Sara Mbara.
39Anyị sitekwara nʼebe ahụ gafee Ọnụ Ụzọ Ama Ifrem, Ọnụ Ụzọ ama Jeshana, Ọnụ Ụzọ Ama Azụ, Ọnụ Ụzọ Ama Ụlọ Elu Hananel, ruokwa nʼỌnụ Ụzọ Ama Ụlọ Elu Narị na ruo nʼỌnụ Ụzọ Ama Atụrụ, kwụsị nʼỌnụ Ụzọ Ama Ndị Nche.
40Ya mere, ụzọ ndị mmadụ abụọ na-abụ abụ ekele nye Chineke zukọtara bata nʼụlọnsọ ukwu. Esokwa m ha bata, mụ na ọkara ndị ndu,
41tinyere ndị nchụaja ndị a: Eliakịm, Maaseia, Miniamin, Mikaya, Elioenai, Zekaraya na Hananaya. Ndị a niile ji opi ha.