21Ma a dọrọ ha aka na ntị, sị, “Gịnị ka unu ji na-anọ ọnọdụ abalị nʼakụkụ mgbidi a? Ọ bụrụ na unu eme ya ọzọ, aga m enye iwu ka e jide unu.” Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ha abịakwaghị ọzọ nʼụbọchị izuike.
22Mgbe ahụ, enyere m ndị Livayị iwu ka ha doo onwe ha ọcha, nọọkwa na nche nʼọnụ ụzọ ama, ịhụ na onye ọbụla doro ụbọchị izuike nsọ. Chineke m, biko, cheta m nʼihi ihe ọma ndị a niile, nwee amara nʼebe m nọ, dịka ịba ụba nke obi ebere gị si dị.
23Ọzọ, nʼụbọchị ndị ahụ a hụrụ m ndị ikom Juda ndị lụtara ndị inyom site nʼetiti ndị Ashdọd, na ndị Amọn, na ndị Moab,
24chọpụtakwa na ọkara nʼetiti ụmụ ha na-asụ naanị asụsụ ndị Ashdọd, maọbụ otu asụsụ nke ndị mba ọzọ, ma ha amaghị asụsụ Juda ma ọlị.
25Ya mere, abaara m ha mba, bụkwaa ha ọnụ. Ụfọdụ ha ka m tiri ihe, dọọkwa ha nʼagịrị isi. Emesịa, emere m ka ha ṅụọ iyi nʼaha Chineke si: “Unu agaghị ekwekwa ka ụmụ ndị ikom na ndị inyom unu lụọ ndị mba ọzọ ma unu onwe unu agakwaghị alụtara ụmụ unu, maọbụ onwe unu, ndị inyom ndị mba ọzọ.