Nehemaya 13

Mgbe a gụpụtara iwu a, ndị Izrel chụpụrụ ndị mba ọzọ niile nọ nʼọgbakọ ha.

Nehemiah 13:3 (UKJV) Now it came to pass, when they had heard the law, that they separated from Israel all the mixed multitude.

1Nʼụbọchị ahụ, a gụpụtara okwu Chineke na ntị ndị Izrel site nʼakwụkwọ iwu Mosis. Mgbe a na-agụpụta ya, a chọpụtara na o megidere iwu na onye Amọn, maọbụ onye Moab, ga-eso nʼofufe ụlọnsọ ukwu Chineke.

2Nʼihi na ha bụ ndị iro ụmụ Izrel. Ha enyeghị ha ihe oriri na ihe ọṅụṅụ kama ha zụrụ Belam ka ọ bụọ ụmụ Izrel ọnụ. (Ma Chineke anyị gbanwere ịbụ ọnụ ahụ mee ka ọ ghọọ ngọzị.)

3Mgbe a gụpụtara iwu a, ndị Izrel chụpụrụ ndị mba ọzọ niile nọ nʼọgbakọ ha.

4Ma tupu ihe ndị a niile emee, Eliashib onye bụ onye nchụaja, onye e doro nʼisi ilekọta ime ụlọ a na-achịkọba ihe nʼụlọ Chineke anyị, ya na Tobaya nwee ezi mmekọrịta,

5o weere otu ọnụụlọ buru ibu a na-achịkọba ihe nye ya. Na mbụ, ọ bụ ọnụụlọ ebe a na-achịkọta onyinye ọka na ụda na-esi isi ụtọ, na ngwongwo ụlọnsọ, na efere mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv. Mosis enyelarị ya nʼiwu na ọ bụ ndị Livayị na ndị ọbụ abụ na ndị nche nwe onyinye ndị ahụ. Ndị nchụaja nwekwa oke nʼihe ndị a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.