Nehemaya 2

Mgbe ahụ, asịrị m ya, “Ọ bụrụ na ọ ga-amasị eze, aga m achọ ka i nye m akwụkwọ nke m ga-enye ndịisi ọchịchị niile nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, ka ha kwere ka m site nʼobodo ha gafee ruo mgbe m ga-eru na Juda.

Nehemiah 2:7 (UKJV) Moreover I said unto the king, If it please the king, let letters be given me to the governors beyond the river, that they may convey me over till I come into Judah;

5ma zaa eze sị, “Ọ bụrụ na ọ ga-amasị eze, biko, ọ bụrụkwa na ohu gị achọta ihuọma nʼanya gị, ana m arịọ ka ị ziga m Juda, bụ obodo nna nna m ha, ka m gaa wugharịakwa ya.”

6Eze sịrị m, ebe nwunye ya nọkwa nʼakụkụ ya, “Ije gị ọ ga-abụ ruo olee mgbe, olee mgbe ị ga-alọghachitekwa?” Ọ masịrị eze i ziga m. Ya mere, enyere m ya oge.

7Mgbe ahụ, asịrị m ya, “Ọ bụrụ na ọ ga-amasị eze, aga m achọ ka i nye m akwụkwọ nke m ga-enye ndịisi ọchịchị niile nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, ka ha kwere ka m site nʼobodo ha gafee ruo mgbe m ga-eru na Juda.

8Nyekwa m akwụkwọ ozi m ga-enye Asaf, onye na-elekọta ọhịa eze, ka o nye m osisi nke a ga-eji rụzie ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ụlọnsọ, na nke a ga-eji rụọ mgbidi obodo ahụ, na nke m ga-eji rụọ ụlọ nke aka m.” Eze meere m ihe ndị a niile, nʼihi na aka ebere Chineke dịnyere m.

9Mgbe m rutere obodo ndị a dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, enyere m ndịisi ọchịchị niile akwụkwọ ahụ eze dere nye m. Eze dunyere m ndịisi agha na ndị agha na-agba ịnyịnya ka ha chebe m nʼije m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.