Nehemaya 4

Ndị na-edo nkume na ndị ọrụ ọbụla debere ngwa ọgụ ha nʼebe ọ ga-eru ha aka mgbe ọbụla ha na-arụ ọrụ.

Nehemiah 4:17 (UKJV) They which built on the wall, and they that bare burdens, with those that laded, every one with one of his hands wrought in the work, and with the other hand held a weapon.

15Mgbe ndị iro anyị chọpụtara na anyị amatala izu ọjọọ ha, na Chineke emebiekwala atụmatụ ha, anyị onwe anyị laghachiri nʼọrụ anyị nke iwuzi mgbidi ahụ.

16Sitekwa nʼoge ahụ gaa nʼihu, anyị kere onwe anyị ụzọ abụọ. Ụfọdụ ndị ji ùbe, ọta na ụta na-anọ na nche mgbe ndị ọzọ na-arụ ọrụ. Ndịisi niile pụtakwara guzo nʼazụ ndị Juda niile ebe ha nọ nʼihu ọrụ ha.

17Ndị na-edo nkume na ndị ọrụ ọbụla debere ngwa ọgụ ha nʼebe ọ ga-eru ha aka mgbe ọbụla ha na-arụ ọrụ.

18Ndị ọzọ tinyere mma agha ha nʼukwu ha. Ndị na-egbu opi nọkwa m nʼakụkụ mgbe niile maka ịfụ opi mgbe a chọrọ ya.

19Mgbe ahụ, asịrị m ndị niile a na-asọpụrụ, ndị ọchịchị na ndị mmadụ ọzọ ahụ niile, “Ọrụ anyị nwere ịrụ dị ukwuu, gbasapụkwa, anyị anọkọtaghị ọnụ nʼotu ebe, ekewakwara anyị ebe dị iche iche na mgbidi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.