Nehemaya 4

Tobaya onye Amọn, onye nọ ya nʼakụkụ mgbe ahụ, kwukwara okwu sị; “Leenụ ụdị mgbidi ha na-ewu! Ọ bụrụ na nkịta ọhịa arịkwasị ya nʼelu ọ ga-ada!”

Nehemiah 4:3 (UKJV) Now Tobiah the Ammonite was by him, and he said, Even that which they build, if a fox go up, he shall even break down their stone wall.

1Iwe were Sanbalat nke ukwuu mgbe ọ nụrụ na anyị na-ewuzigharị mgbidi ahụ niile. O were iwe dị ọkụ, ọnụma jukwara ya obi. Ọ chịrị ndị Juu ọchị, kwaakwa ha emo.

2Nʼihu ndị otu ya na ndịisi agha Sameria, o kwuru si, “Gịnị ka ndị Juu ole na ole a na-adịghị ike na-eme? Ha na-achọ iwugharị mgbidi obodo a? Ha ga-achụ aja? Ha ga-arụcha ọrụ niile nʼotu ụbọchị? Ha ga-esita nʼaja a kụpịasịrị akụpịa mee ka nkume ndị a dị ndụ, ka ọ bụ site na nkume ochie ndị a akpọrọ ọkụ?”

3Tobaya onye Amọn, onye nọ ya nʼakụkụ mgbe ahụ, kwukwara okwu sị; “Leenụ ụdị mgbidi ha na-ewu! Ọ bụrụ na nkịta ọhịa arịkwasị ya nʼelu ọ ga-ada!”

4Mgbe ahụ, e kpere m ekpere sị, “Chineke, biko nụrụ emo a na-akwa anyị. Ka ịkwa emo ha laghachikwa ha nʼisi; ka a dọtakwa ha nʼagha buru ha jee mba ọzọ.

5Elefula mmehie ha anya, agbagharakwala ha, nʼihi na ha ledara gị anya, ledakwa anyị anya, bụ ndị na-ewuzi mgbidi gị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.