8Ha gụpụtara site nʼakwụkwọ iwu Chineke ahụ, sụgharịa ya, kọwazie ọkpụrụkpụ okwu niile dị nʼihe a gụpụtara, mee ka ndị mmadụ ghọta ihe a na-agụpụta nke ọma.
9Mgbe ahụ, Nehemaya, onyeisi ọchịchị, na Ezra, ode akwụkwọ na onye nchụaja, na ndị Livayị ahụ na-atụziri ndị mmadụ ihe, gwara ndị ahụ niile sị: “Taa bụ ụbọchị dị nsọ nye Onyenwe anyị, Chineke unu. Unu erula ụjụ maọbụ bee akwa.” Nʼihi na ha niile na-akwa akwa mgbe ha na-ege ntị nʼokwu niile nke iwu ahụ.
10Nehemaya gwakwara ha sị; “Laanụ nʼụlọ unu gaa mee mmemme oriri na ọṅụṅụ nyekwanụ ndị na-enweghị nke ha ga-eri. Ụbọchị taa dị nsọ nye Chineke anyị. Unu erukwala ụjụ, nʼihi na ọṅụ Onyenwe anyị bụ ike unu.”
11Ndị Livayị mere ka ndị mmadụ ahụ nọrọ nwayọọ, na-asị, “Nọrọnụ nwayọọ, nʼihi na taa bụ ụbọchị dị nsọ, ọ bụghị ụbọchị iru ụjụ na anya mmiri.”
12Ya mere, ha niile lawara ị ga rie ma ṅụọ, na ikenye ndị ọzọ site nʼihe ha nwere. Ha gakwara ime mmemme nke oke ọṅụ, nʼihi na ha ghọtara okwu agwara ha.