Nehemaya 8

Nʼụbọchị nke abụọ nke ọnwa ahụ, ndịisi ezinaụlọ niile na ndị nchụaja, na ndị Livayị, zukọrọ nʼebe Ezra, bụ onye nkuzi nọ, maka itinye uche nʼakwụkwọ iwu ahụ.

Nehemiah 8:13 (UKJV) And on the second day were gathered together the chief of the fathers of all the people, the priests, and the Levites, unto Ezra the scribe, even to understand the words of the law.

11Ndị Livayị mere ka ndị mmadụ ahụ nọrọ nwayọọ, na-asị, “Nọrọnụ nwayọọ, nʼihi na taa bụ ụbọchị dị nsọ, ọ bụghị ụbọchị iru ụjụ na anya mmiri.”

12Ya mere, ha niile lawara ị ga rie ma ṅụọ, na ikenye ndị ọzọ site nʼihe ha nwere. Ha gakwara ime mmemme nke oke ọṅụ, nʼihi na ha ghọtara okwu agwara ha.

13Nʼụbọchị nke abụọ nke ọnwa ahụ, ndịisi ezinaụlọ niile na ndị nchụaja, na ndị Livayị, zukọrọ nʼebe Ezra, bụ onye nkuzi nọ, maka itinye uche nʼakwụkwọ iwu ahụ.

14Mgbe ha na-agụ ya, ha chọpụtara ebe Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya na ụmụ Izrel kwesiri ibi nʼụlọ ikwu mgbe ọbụla a na-eme mmemme ụlọ ikwu nke a ga-eme nʼọnwa ahụ.

15O kwukwara na ha ga-ekwusa okwu a nʼobodo niile nke Juda na Jerusalem sị; “Gaanụ nʼala ugwu ugwu gbute alaka osisi oliv ụlọ, na alaka oliv ọhịa, na alaka osisi mietul, na alaka nkwụ, na alaka osisi ndị ọzọ na-enye ndo nke a ga-eji wuo ebe unu ga-ebi tutu ruo mgbe mmemme ahụ ga-agwụsị, dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.