Nehemaya 8

Mgbe ahụ, Ezra gọziri Onyenwe anyị Chineke ukwu ahụ, mmadụ niile zakwara sị; “Amen! Amen!” Ha chịlịri aka ha abụọ elu, kpọọ isiala nye Onyenwe anyị.

Nehemiah 8:6 (UKJV) And Ezra blessed the LORD, the great God. And all the people answered, Amen, Amen, with lifting up their hands: and they bowed their heads, and worshipped the LORD with their faces to the ground.

4Ezra onye ode akwụkwọ, rigoro nʼelu ihe mgbakwasị ụkwụ ha mere maka nke a. Ndị guzo nʼaka nri ya bụ, Matitaia, Shema, Anaia, Ụraya, Hilkaya na Maaseia. Ndị guzo nʼaka ekpe ya bụkwa ndị a: Pedaia, Mishael, Malkija, Hashum, Hashbadana, Zekaraya na Meshulam.

5Ezra meghere akwụkwọ ahụ mgbe mmadụ niile na-ahụzu ya nʼihi na o guzoro nʼebe dị elu mgbe ọ na-agụ ya. Mmadụ niile guzoro ọtọ mgbe ọ na-agụ ya.

6Mgbe ahụ, Ezra gọziri Onyenwe anyị Chineke ukwu ahụ, mmadụ niile zakwara sị; “Amen! Amen!” Ha chịlịri aka ha abụọ elu, kpọọ isiala nye Onyenwe anyị.

7Ndị Livayị aha ha bụ Jeshua, Bani, Sherebaya, Jamin, Akub, Shabetai, Hodia, Maaseia, Kelita, Azaraya, Jozabad, Hanan na Pelia, kuziri ndị mmadụ ihe dị nʼIwu mee ka ha ghọta ya dịka ha guzo nʼebe ahụ.

8Ha gụpụtara site nʼakwụkwọ iwu Chineke ahụ, sụgharịa ya, kọwazie ọkpụrụkpụ okwu niile dị nʼihe a gụpụtara, mee ka ndị mmadụ ghọta ihe a na-agụpụta nke ọma.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.