Nehemaya 9

“I sitere nʼeluigwe gwa ha okwu, ị rịdatara nʼugwu Saịnaị, ị nyere ha iwu na ntụziaka niile ziri ezi, nyekwa ha ụkpụrụ na ihe niile dị mma nke enyere nʼiwu.

Nehemiah 9:13 (UKJV) You came down also upon mount Sinai, and spoke with them from heaven, and gave them right judgments, and true laws, good statutes and commandments:

11I kewara Osimiri Uhie abụọ mee ka ndị gị site nʼala akọrọ gafee. Ma i mere ka ndị iro ha na-achụ ha ọsọ nwụọ nʼime oke osimiri ahụ. Ha mikpuru dịka nkume danyere nʼime mmiri, nke oke osimiri.

12I ji ogidi igwe ojii duo nna nna anyị ha nʼehihie, ma were ogidi ọkụ duo ha nʼabalị, inye ha ìhè ka ha ghara ijehie ụzọ.

13“I sitere nʼeluigwe gwa ha okwu, ị rịdatara nʼugwu Saịnaị, ị nyere ha iwu na ntụziaka niile ziri ezi, nyekwa ha ụkpụrụ na ihe niile dị mma nke enyere nʼiwu.

14I mere ka ha mata ụbọchị izuike gị dị nsọ, nyekwa ha iwu site nʼọnụ ohu gị Mosis, ka ha debe iwu gị na ụkpụrụ gị niile.

15I sitere nʼeluigwe nye ha achịcha mgbe agụụ gụrụ ha, sitekwa na nkume nye ha mmiri mgbe akpịrị kpọrọ ha nkụ. I sịkwara ha baa nʼime ala ahụ inweta ala ahụ bụ nke i weliri aka gị ṅụọ iyi inye ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.